Skip to main content

Okwu Nkwenye: #NKWUCHIONYE 26TH EPRIL. BIKO KWUO NA KingsChat Web

Devotional

#NKWUCHIONYE 25TH EPRIL.

BIKO KWUO NDỊ A N'ỌNỤ.

Nna nke ọma, ekele m gi maka ịhọrọ m ịmata uche gị. Ebe m siri ike na okwu gị, na-amị mkpụrụ nke ezi omume, maka ebube gị. Ekele m gi maka ịtọ m n'ọrụ ebube, amara, na ekele. Ana m eje ije n'uzọ ndị ịtọpụtara tupu oge, ya mere, ọ dịghị otu nzọụkwụ m ga-asụpụ. Ana m enweta mmeri n'ụzọ niile; n'ihi na ị kwadoro m n'ezi omume, ma nye m amamihe ime uche gị mgbe niile.

Ekele m gi maka ịkụziri m mmụọ site n'Okwu gị na inyere m aka ịghọta ezi ihe mere ndụ ji dị. Ebi m maka ozi ọma. Ebi m maka iwulite na ịgbasa alaeze gị n'ụwa! Daalụ maka ịgọzi m na ihe niile m chọrọ maka ndụ na ịdị nsọ; n'ezie, ihe niile bụ nke m. Ekele m gi nke ukwuu maka ngọzi gị na-enweghị nsọtụ n'ime ndụ m. Daalụ maka ike nke Mmụọ Nsọ nke na-arụ ọrụ n'ime m iji gwa ndị nọ n'ụwa m ozi ọma nke ọma, na n'ebe ndị ọzọ.

Amara gị ka a tọhapụrụ ugbu a ka obi dị iche iche nwee mmetụta ma gbanwee site na ozi nke ike nzọpụta gị. Daalụ maka ịhụnanya gị n'ime obi m; ana m eje ije n'ike n'ụbọchị a n'ihi na ị nyere m mmụọ ike, ịhụnanya, na uche dị mma! Ana m eje ije n'ụzọ kwesịrị gị ruo n'ọṅụ niile, na-enwe ọṅụ na ị mere ka m nwee mmeri n'elu egwu, Setan, na ụwa, n'aha Jizọs. Amen!

Nọgide na-ekwu ya, bipụta ya ebe niile; mee ka ọ bụrụ ihe a maara! N'ime Kraịst, anyị nwere ihe anyị ga-eti mkpu maka ya. Ka anyị jupụta ikuku, ịntanetị na mgbasa ozi e biri ebi na eziokwu nke Kraịst. Kwusie n'asụsụ ndị ọzọ ugbu a. ~ Pastor Chris Oyakhilome.

Salvation Prayer

O Lord God, I believe with all my heart in Jesus Christ, Son of the living God. I believe He died for me and God raised Him from the dead. I believe He's alive today.

I confess with my mouth that Jesus Christ is the Lord of my life from this day. Through Him and in His Name, I have eternal life; I'm born again.

Thank you Lord, for saving my soul! I'm now a child of God. Hallelujah!

Follow Us

Follow Us